Egwu MMỤTAKA
Mmụtaka bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di na Umunze Anambra Steeti. / From Wikipedia, the free encyclopedia
Mmụtaka[1] bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di n' Umunze Anambra Steeti. Egwu a si n' egwu a na-akpo Mkpọkịtị wee pụta. Egwu a bụ mmụtaka bidoro n' ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, a na-agbakari ya site na elekere iri ụtụtụ ruo elekere iri na ofu. A na eme nke a ma ụra tụba ụmụ akwukwo, ewe si ha pụta iro. Ha putakwanụ iro ahụ, ha emegharicha áhụ wee banye kwaa wee guwazie kwa akwụkwọ, ụra apụ. Oge ana-eme ihe a ka Mkpọkịti a nke bukwa aha onye egwu a sitere n’aka ji nwe wee hụkọtachaa ụmụaka ndị mere ihe a. Ka umuaka a na eme ya mgbe o bula, ha wee buru ụmụaka siri ike wee gosikwa na o bu onye siri ike ga-agbawu egwu a. Nke a mere akpo egwu a Mkpokịti.
Site mgbe ahu, a na-agbazi egwu a. Amatara ihe gbanyere egwu a na afo 1970s. E jiri egwu Mkpokiti merie otutu ogene olaedo ugboro na ato na Naịjirịa. O bu ya ka agbara na afo 1970 mgbe emere National competition nke mbu nke ndi Arts and Culture ebe egwu a nwetere ogene olaedo nke izu. Egwu were nwetakwa ogene olaedo ozo na afo 1971 na obodo Ibadan. Otu a ka o dikwa na afo 1972 na Kaduna mgbe o bukwere ogene olaedo ahu ozo.
Otito a nukwa na obodo Umunze ruo taa. A gbagidere egwu a ruzie oge Mkpokịti onye o bidoro na aka nwụrụ. Egwu Mkpokiti wee kewazie na otu di iche iche nke Mmutaka bu otu n’ime ha.
Ihe eji kpọọ egwu a Mmụtaka bu oke a no na mkpokiti ahu udi ihe a na agba, ndi mmadu wee che na enwere ọgwụ di ya. Mana a na enwe nkowa na ihe a na-agba bu ihe amụtara amụta nke kariri ọgwụ.
E nwere otutu akwa eji aku mmutaka. Ha bu igba nke a ji agbazi otu esi agba egwu a n'usoro n'usoro, ịchaka na ogwe. Ogwe bu nke na enyere igba aka na ibuputa uda egwu. Igba a bukwa ma nke ukwu ma nke obere. Enwe kwara ogene, ekwe ero, na opi.[2][3]